Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 19:7-19 Bible Nso (IGBOB)

7. Ka ayi ṅuria ọṅu, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke-uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n'ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya.

8. Ewe kweyere ya ka o b͕okwasi onwe-ya ezi ákwà ọcha nēnwu enwu, nke di kwa ọcha: n'ihi na ezi ákwà ọcha ahu bu ezi omume nile nke ndi nsọ.

9. O we sim, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi akpọworo ibia na nri-anyasi ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu. O we sim, Ndia bu okwu nke Chineke kwuru n'ezie.

10. M'we da n'ala n'iru ukwu-ya ikpọ isi ala nye ya. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi nke nwere àmà nke Jisus: kpọ isi ala nye Chineke: n'ihi na àmà nke Jisus bu mọ nke amuma.

11. M'we hu elu-igwe ka o gheworo oghe; ma le, inyinya ọcha di, na Onye nānọkwasi ya, bú Onye anākpọ Onye kwesiri ntukwasi-obi na Onye-ezi-okwu; ọ bu kwa n'ezi omume ka Ọ nēkpe ikpé, nēbu kwa agha.

12. Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n'isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya.

13. Eb͕okwasiwo kwa Ya uwe nke efesaworo ọbara: akpọwo kwa aha-Ya Okwu Chineke.

14. Usu nile nke ndi-agha ndi di n'elu-igwe we so Ya n'elu inyinya ọcha, nēyi ezi ákwà ọcha, nke di ọcha nēnwu kwa enwu.

15. Mma-agha di nkọ nēsi kwa n'ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n'aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile.

16. O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile.

17. M'we hu otù mọ-ozi ka ọ nēguzo nime anyanwu; o we were oké olu tie nkpu, nāsi nnunu nile nke nēfe n'etiti elu-igwe, Bianu, zukọ iri oké nri-anyasi nke Chineke;

18. ka unu we rie anu-aru ndi-eze, na anu-aru ndi-ọchi-agha, na anu-aru ndi di ike, na anu-aru inyinya na nke ndi nānọkwasi ha, na anu-aru madu nile, ma ndi nwere onwe-ha ma ndi-orù, ma ndi ntà ma ndi uku.

19. M'we hu anu-ọhia ahu, na ndi-eze uwa, na usu nile nke ndi-agha-ha, ka ha zukọrọri ibu agha megide Onye ahu Nke nānọkwasi inyinya ahu, megide kwa usu-ndi-agha-Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 19