Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 18:19-24 Bible Nso (IGBOB)

19. Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu.

20. Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.

21. Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n'oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli.

22. Agaghi-anu kwa olu ndi nākpọ ubọ-akwara na ndi nākpọ ubọ ọzọ na ndi nēb͕u ọ̀jà na ndi nāfù opì nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-ahu kwa onye-ọ̀kà ọ bula, nke nēme ǹkà ọ bula, nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke nkume-igwe-nri nime gi ọzọ ma-ọli;

23. ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.

24. Ọ bu kwa nime ya ka ahuru ọbara nke ndi-amuma na nke ndi nsọ, na nke ndi nile eb͕uworo n'elu uwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 18