Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 18:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. Nkpuru-osisi nile nke nāgu nkpuru-obi-gi apuwo n'ebe i nọ, ihe nile nātọ utọ nke ma-kwa-ra nma apuwo kwa n'aka-gi la n'iyì, madu agaghi-ahu kwa ha ọzọ ma-ọli.

15. Ndi-ahia ndi nāzu ihe ndia, ndi gburugburu ọgaranya site na ya, ha gēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nākwa ákwá, nēru kwa újú;

16. nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke eb͕okwasiworo ya ezi ákwà ọcha na ákwà nācha ọbara-ọbara na ákwà uhie, nke ewerewo-kwa-ra ọla-edo na nkume di oké ọnu-ahia na pearl ke ya!

17. n'ihi na n'otù oge hour emere ka oké àkù di otú a tọb͕ọ n'efu. Ndi-isi-ub͕ọ nile n'otù n'otù, na onye ọ bula nke nēje n'ebe ọ bula n'ub͕ọ, na ndi-ub͕ọ, ka ha ra kwa, bú ndi nālu ọlu nime oké osimiri, ha guzo-kwa-ra n'ebe di anya,

18. ti kwa nkpu mb͕e ha nēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya, si Òbodo gini yiri obodo uku a?

19. Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu.

20. Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.

21. Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n'oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 18