Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 18:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi nelu-igwe ridata, nēnwe ike uku; ewe site n'ebube-ya nye uwa ìhè.

2. O we were olu ike tie nkpu, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, ọ ghọwo kwa ebe-obibi nke ndi-mọ ọjọ, na ulo-nkpọrọ nke mọ nile ọ bula nādighi ọcha, na ulo-nkpọrọ nke nnunu nile ọ bula nke nādighi ọcha nke akpọwo-kwa-ra asì.

3. N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 18