Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 11:9-19 Bible Nso (IGBOB)

9. Madu we si n'etiti ndi nile na ebo nile na asusu nile na mba nile puta nēle ozu-ha ubọchi atọ na nkera otù ubọchi, ha ekweghi kwa ka atọb͕ọ ozu-ha n'ílì.

10. Ndi bi n'elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n'isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n'ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n'elu uwa aru.

11. Mb͕e ubọchi atọ na nkera otù ubọchi ahu gasiri Mọ nke ndu nke si na Chineke puta we bata nime ha, ha we guzo n'ukwu-ha; oké egwu we dakwasi ndi nēkiri ha.

12. Ha we nu oké olu nke si n'elu-igwe da, ka ọ nāsi ha, Rigotanu n'ebe a. Ha we rigo rue n'elu-igwe nime igwe-oji ahu; ndi-iro-ha kiri-kwa-ra ha.

13. N'otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n'uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto.

14. Ahuhu nke-abua agabigawo: le, Ahuhu nke-atọ nābia ọsọsọ.

15. Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

16. Orú ndi-okenye na anọ ahu, ndi nānọdu n'iru Chineke n'elu oche-eze-ha, we da kpuchie iru ha n'ala, we kpọ isi ala nye Chineke,

17. si, Ayi nēkele Gi, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri; n'ihi na I werewo oké ike-Gi, I bukwa eze.

18. Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.

19. Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 11