Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 10:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;

2. ọ nējide kwa nwa akwukwọ ntà n'aka-ya, nke asagheworo: o we tukwasi ukwu aka-nri ya n'elu oké osimiri tukwasi kwa ukwu aka-ekpe ya n'elu ala;

3. o we were oké olu tie nkpu, dika ọdum nāb͕ọ uja: mb͕e o tiri nkpu, éb͕è-elu-igwe asa ahu we kwue olu-ha.

4. Ma mb͕e éb͕è-elu-igwe asa ahu kwuru okwu, agajem ide akwukwọ: m'we nu olu si n'elu-igwe da, si Kà ihe éb͕è-elu igwe asa ahu kwuru akàrà, ede-kwa-la ha n'akwukwọ.

5. Mọ-ozi ahu, nke m'huru ka ọ nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala, we welie aka-nri-ya zó n'elu-igwe,

6. we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:

7. ma n'ubọchi nke olu mọ-ozi nke-asa ahu, mb͕e ọ gaje ifù opì, agēme kwa ka ihe-omimi nke Chineke zu okè, dika O zìri ozi ọma nye ndi-orù-Ya, bú ndi amuma-Ya.

8. Olu ahu nke m'nuru ka ọ nēsi n'elu-igwe da, anu-kwa-ram ya ọzọ ka ọ nākpayerem uka, si, Je, nara akwukwọ ahu nke asagheworo, bú nke di n'aka mọ-ozi ahu onye nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala.

9. M'we jekuru mọ-ozi ahu, si ya ka o nyem nwa akwukwọ ntà ahu. O we sim, Nara ya, ripia kwa ya; ọ gēme kwa ka afọ-gi lue ilu, ma n'ọnu-gi ọ gātọ utọ dika manu-aṅu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 10