Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 1:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Nkpughe nke Jisus Kraist, nke Chineke nyere Ya igosi ndi-orù-Ya, bú ihe nāghaghi iputa n'isi nso: O we site n'aka mọ-ozi-Ya ziga we gosi Jọn orù-Ya;

2. onye b͕ara àmà nke okwu Chineke, na nke àmà Jisus Kraist, ka ha ra, bú ihe ọ huru.

3. Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n'ihi na oge ahu di nso.

4. Jọn nēdegara nzukọ Kraist asa nke di n'Esia akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo, nke si n'aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye dikwari, Onye nābia kwa; nke si kwa n'aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n'iru oche-eze-Ya;

5. nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;

6. O we me ka ayi buru ala-eze, ndi-nchu-àjà nye Chineke na Nna nke Ya; ọ bu Ya ka otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

7. Le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya, ndi ahu gāhu kwa Ya, bú ndi mara Ya ube; ebo nile nke uwa gēti-kwa-ra ya aka n'obi. E, Amen.

8. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, ka Onye-nwe-ayi Chineke kwuru, bú Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye nābia kwa, Onye puru ime ihe nile.

9. Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m'nọ n'agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n'ihi okwu Chineke na àmà Jisus.

10. Emere ka m'nọ nime Mọ Nsọ n'ubọchi Onye-nwe-ayi, m'we nu otù oké olu n'azum, dika nke opì,

11. ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.

12. M'we chigharia ile olu ahu nke nākpayerem uka. Mb͕e m'chigharisiri m'we hu ihe-idọba-oriọna asa nke eji ọla-edo me;

13. n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu ahu-kwa-ram otù Onye yiri nwa nke madu, Onye nēyi uwe nke ruru n'ukwu ala, ewerewo kwa ihe-ọkiké nke ọla-edo ke n'obi-Ya gburugburu.

14. Isi-Ya na agiri-isi-Ya di kwa ọcha dika aji-anu ọcha, dika snow; anya-Ya abua di kwa ka ire ọku;

15. ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu, dika agāsi na erere ya-ri n'oké ọku; olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri.

16. O nwe-kwa-ra kpakpando asa n'aka-nri-Ya: mma-agha di nkọ nke nwere iru abua nēsi kwa n'ọnu-Ya puta: iru-Ya di kwa ka anyanwu nāmu n'ike-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 1