Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 9:15-29 Bible Nso (IGBOB)

15. N'ihi na Ọ si Moses, M'gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M'nēmere ebere, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ọ bula, bú onye M'gēnwe obi-ebere n'aru-ya.

16. Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke.

17. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile.

18. Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.

19. Ya mere i gāsim, Gini mere Ọ nọ nāta uta? N'ihi na ọ̀ bu onye nēguzogide ihe O zubere?

20. Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a?

21. Ma-ọbu ọkpu-ite, ò nweghi ike n'ebe urọ di, isite n'otù ọkpukpu-urọ ahu o doziri me nka ka ọ buru ihe gānara nsọpuru, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru ihe agēme ihe-ihere?

22. Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì:

23. ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n'aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n'ebube,

24. bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ?

25. Dika O nēkwu kwa n'akwukwọ Hosea, si,M'gākpọ ndi ahu ndim, nke nābughi ndim;M'gākpọ kwa nwanyi ahu onye ahuru n'anya, nke anāhughi n'anya.

26. O gēru kwa, na n'ebe ahu nke asiri ha, Ọ bughi ndim ka unu bu,N'ebe ahu ka agākpọ ha umu-ndikom nke Chineke di ndu.

27. Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa:

28. n'ihí na Onye-nwe-ayi gēme ihe O kwuru n'elu uwa, nēmezu ya nēme kwa ya ka o bìe.

29. Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue,Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru,Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 9