Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 7:23-25 Bible Nso (IGBOB)

23. ma anamahu iwu di iche n'ihe nile dim n'aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n'agha nye iwu nke nmehie nke di n'ihe nile dim n'aru.

24. Madu nke hujuru anya ka mu onwem bu! ònye gādọputam n'aru nke ọnwu a?

25. Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Ya mere otú a mu onwem ji uchem buru orù nke iwu Chineke; ma ejim anu-arum buru orù nke iwu nmehie.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 7