Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 7:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. Ya mere, èzi ihe ahu ghọrọ ọnwu n'ebe m'nọ? Chineke ekwela. kama ọ bu nmehie, ka o we puta ìhè na ọ bu nmehie, site n'iwere ezi ihe ahu lutaram ọnwu; ka nmehie we site n'ihe ahu enyere n'iwu ghọ ihe nēmehie nke-uku ri nne.

14. N'ihi na ayi matara na iwu ahu bu ihe nke Mọ: ma mu onwem bu ihe nke anu-aru, erewokwam inọ n'okpuru nmehie.

15. N'ihi na ihe m'nāluta ka m'nāmagh: n'ihi na ihe m'nāchọ, ọ bughi ihe ahu ka m'nēme; kama ihe m'nākpọ asì, ihe ahu ka m'nēme.

16. Ma ọ buru na ihe m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme, anamekweye iwu ahu na ọ bu ihe ọma.

17. Ma ub͕u a ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie.

18. N'ihi na amataram na ezi ihe adighi-ebi nimem, nke ahu bu, n'anu-arum: n'ihi na ichọ ihe ọma di nso n'ebe akam gēru, ma iluta ihe ọma adighi nso n'ebe akam gēru.

19. N'ihi na ezi ihe nke m'nāchọ ka m'nēmegh: kama ihe ọjọ nke m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme.

20. Ma ọ buru na ihe m'nachọghi, ihe ahu ka m'nēme, ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 7