Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 6:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Gini ka ayi gēkwu kwa? Àyi gānọgide na nmehie, ka amara we rie nne?

2. Chineke ekwela. Ayi onwe-ayi, bú ndi nwuru n'ebe nmehie di, àyi gēsi aṅa nādi ndu ọzọ nime ya?

3. Ma-ọbu ùnu amaghi na ka ayi-ra, bú ndi emere baptism iba nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n'ọnwu-Ya?

4. Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a.

5. N'ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n'ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe;

6. ebe ayi mara nka, na akpọgidekọrọ Ya na madu ochie ayi n'obe, ka ewe me ka aru-ayi nke nmehie nwezu ghara idi irè, ka ayi we ghara idi nābu orù nke nmehie ọzọ;

7. n'ihi na onye nwuru anwu, aguwo ya o'nye ezi omume pua na nmehie-ya.

8. Ma ọ buru na ayi na Kraist nwukọrọ, ayi kwere na ayi na Ya gādikọ kwa ndu ọzọ;

9. n'ihi na ayi matara na ebe emere ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie Ọ gaghi-anwu ọzọ; ọnwu abughi kwa onye nēnwe Ya ọzọ.

10. N'ihi na ọnwu Ọ nwuru, Ọ nwuru nání otù ọnwu n'ebe nmehie di: ma ndu Ọ nādi, Ọ nādi n'ebe Chineke nọ.

11. Otú a unu onwe-unu, nāgu-kwa-nu na unu onwe-unu bu ndi nwuru anwu n'ebe nmehie di, ma na unu nādi ndu nime Kraist Jisus n'ebe Chineke nọ.

12. Ya mere, ka nmehie ghara idi nābu eze n'aru-unu nke puru inwu anwu, ime unu ka unu ṅa agu-ya nile nti:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 6