Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 3:10-22 Bible Nso (IGBOB)

10. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;

11. Ọ dighi onye nāghọta,Ọ dighi onye nāchọ Chineke;

12. Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù;Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:

13. Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ:Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

14. Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:

15. Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;

16. Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha;

17. Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:

18. Egwù Chineke adighi n'anya-ha.

19. Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:

20. n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.

21. Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà;

22. ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 3