Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 3:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara?

2. Ọ bara urù ri nne n'uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n'ọnu Chineke puta nye ha n'aka na ntukwasi-obi.

3. N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?

4. Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile,Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.

5. Ma ọ buru na ajọ omume-ayi eme ka ezi omume Chineke puta ìhè, gini ka ayi gēkwu? Chineke, Onye nēme ka iwe-Ya dakwasi ayi, Ọ̀ bu onye ajọ omume? (Anamekwu dika madu.)

6. Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?

7. Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n'iwetara Ya ebube site n'okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie?

8. gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi.

9. Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie;

10. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;

11. Ọ dighi onye nāghọta,Ọ dighi onye nāchọ Chineke;

12. Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù;Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:

13. Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ:Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

14. Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:

15. Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 3