Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 16:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma anameme ka unu mara Fibi nwa-nna-ayi nwanyi, onye nējere nzukọ Kraist nke di na Kenkrii ozi:

2. ka unu we nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi, dika o kwesiri ndi nsọ, ka unu nēguzo kwa ya nso iyere ya aka n'okwu ọ bula nkpà unu gākpa ya: n'ihi na ya onwe-ya aburuwo kwa onye nēguzoro ọtutu madu izọ ha, mu onwem kwa.

3. Kelenu Priska na Akwila ndi mu na ha nālukọ ọlu nime Kraist Jisus,

4. madu ndi tọb͕ọrọ olu nke aka ha n'ihi ndum; ndi ọ bughi nání mu onwem nēkele, kama nzukọ Kraist nile nke ndi mba ọzọ kwa:

5. kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m'huru n'anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist.

6. Kelenu Meri, n'ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu n'ọtutu ihe nye unu.

7. Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n'agha, madu ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist.

8. Kelenu Amplietọs, onye m'huru n'anya nime Onye-nwe-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 16