Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 15:20-33 Bible Nso (IGBOB)

20. ma nka ka m'mere nējisi ike izisa ozi ọma ahu otú a, ọ bughi ebe akpọrọri aha Kraist, ka m'ghara iwu ulo n'elu ntọ-ala onye ọzọ;

21. kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ,Ha gāhu, bú ndi akākọghi akukọ Ya mb͕e ọ bula,Ndi akānughi kwa gāghọta.

22. N'ihi nka eb͕ochi-kwa-ram ọtutu oge ndia ibiakute unu:

23. ma ub͕u a, ebe m'nēnweghi ebe ọ bula n'akuku ndia ọzọ, ebe ibiakute unu nāgusikwam ike ọtutu arọ ndia gara aga,

24. mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu)

25. ma ub͕u a, ka m'kwuru, agam Jerusalem, ebe m'nējere ndi nsọ ozi.

26. N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ.

27. N'ihi na ọ di ha ezi nma; ha bu kwa ndi ji ndi ahu ugwọ. N'ihi na asi na ndi mba ọzọ nwekọrọ ihe Mọ Nsọ nke ha, ha ji kwa ugwọ ifè ha òfùfè n'ihe nke anu-aru.

28. Ya mere mb͕e m'mezusiri nka, ka-kwa-ra ha nkpuru a akàrà, m'gēsi na nke unu je Spain.

29. Ma amataram na, mb͕e m'biakutere unu, ọ bu nime ozuzù ngọzi nke Kraist ka m'gābia.

30. Ma, umu-nnam, ewerem Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, were kwa ihu-n'anya Mọ Nsọ, nāriọ unu, ka unu som nāb͕asi nb͕a ike n'ekpere unu nēkpere Chineke n'ihim;

31. Ka ewe dọputam n'aka ndi nēkweyeghi ekwenye ndi nọ na Judia, ka ije-ozim nke m'ji je Jerusalem we búru kwa ihe ndi nsọ gānara nke-ọma;

32. ka m'we biakute unu n'ọṅù site n'ọchichọ Chineke, ka mu na unu we zukọ kwa ike.

33. Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 15