Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 12:6-14 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma ebe ayi nwere onyinye-amara di iche iche dika amara nke enyere ayi si di, ma ayi nwere ibu-amuma, ka ayi nēbu amuma ka okwukwe-ayi ra;

7. ma-ọbu ije-ozi, ka ayi nānọ n'ije-ozi-ayi; ma-ọbu onye nēzi ihe, ya nọ n'ozizi-ya;

8. ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya.

9. Ka ihu-n'anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n'aru.

10. N'akuku ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ, ka ihe madu-ibe-unu nātọrita unu utọ nke-uku; n'akuku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ;

11. n'akuku inu-ọku nke obì-unu, nāgharanu idi ọ̀bọ̀; n'akuku mọ-unu, nādinu ọku; n'akuku Onye-nwe-ayi, nābunu orù;

12. n'akuku olile-anya-unu, nāṅurinu ọṅu; n'akuku nkpab͕u-unu, nēnwenu ntachi-obi; n'akuku ekpere-unu, nānọgidesinu ike;

13. n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma.

14. Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 12