Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Kọlọsi 4:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),

11. Jisus kwa, onye anākpọ Justọs, madu atọ ndia sitere n'obibì-úgwù: nání ndia bu ndi sorom nālukọ ọlu n'ikwusa ala-eze Chineke, madu ndi emere ka ha burum ndi-ngugù-obi.

12. Epafras, onye bu otù onye n'etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n'ihi unu n'ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ.

13. N'ihi na anamab͕ara ya àmà, na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nke-uku nye unu na ndi nọ na Leọdisia na ndi nọ na Hierapọlis.

14. Luk, bú dibia nke ahuru n'anya, nēkele unu, ya na Dimas.

15. Kelenu umu-nna-ayi ndi nọ na Leọdisia, na Nimfas, na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.

16. Ma mb͕e ọ bula agāgusi akwukwọ-ozi a n'etiti unu, menu ka agu kwa ya na nzukọ Kraist nke ndi Leọdisia; lezi-kwa-nu anya ka unu onwe-unu gu kwa akwukwọ ozi ahu si na Leọdisia bia.

17. Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya.

18. Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de. Chetanu ab͕um. Ka amara diyere unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Kọlọsi 4