2. Tukwasinu uche n'ihe di n'elu, ọ bughi n'ihe di n'elu uwa.
3. N'ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n'ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke.
4. Mb͕e ọ bula agēme ka Kraist-ayi puta ìhè, Onye bu ndu-ayi, mb͕e ahu ka agēme kwa ka unu onwe-unu so Ya puta ìhè n'ebube.
5. Ya mere, menu ka ihe nile di unu n'aru nke di n'elu uwa nwua; ikwa-iko, adighi-ọcha, ọchichọ ọjọ, agu ihe ọjọ, na anya-uku ahu, n'ihi na nka bu ikpere arusi;
6. ọ bu kwa n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekweyeghi-ekweye;
7. nke unu onwe-unu jeghariri nime ha n'oge gara aga, mb͕e unu nādi ndu nime ihe ndia.