isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Kọlọsi 2 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi na anamachọ ka unu mata otú m'nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n'ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n'anu-aru;

2. ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist,

3. Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya.

4. Nka ka m'nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu.

5. N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.

6. Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya,

7. buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.

8. Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:

9. n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,

10. nime Ya ka emezuwo-kwa-ra unu emezu, Onye bu isi nke ibu-onye-isi na ichi-isi nile ọ bula:

11. ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n'iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n'obibì-úgwù nke Kraist;

12. ebe elìkọrọ unu na Ya nime baptism-unu, ọ bu kwa nime ya ka esitere n'aka okwukwe-unu me ka unu so Ya bilikọ, bú okwukwe unu kwere n'ilusi-ọ1u-ike nke Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.

13. Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile;

14. mb͕e O hichapusi-kwa-ra ihe ayi ji aka-ayi de n'akwukwọ ike onwe-ayi ab͕u, nke megidere ayi, bú ihe edere n'iwu nke enyere ayi, nke nēguzogide ayi: O wepuwo kwa ya n'etiti ayi na Ya, nākpọgide ya n'obe-Ya;

15. mb͕e O yipuchasiri n'aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n'iru ọra, nēdughari ha n'ọṅù-agha n'elu obe-Ya.

16. Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n'oriri, ma-ọbu n'ọṅuṅu, ma-ọbu n'okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike:

17. nke bu onyinyo nke ihe gaje ibia; ma aru bu nke Kraist.

18. Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n'ipunara unu ihe unu nāb͕ata n'ọsọ, site n'obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n'ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n'efu,

19. ọ dighi-ejidesi kwa Isi-ayi ike, Onye aru nile, ebe esitere na nkwonkwo-ya na akwara-ya nile nyezu ya ihe jikọ kwa ya n'otù, o sitere na Ya nāba uba nke Chineke.

20. Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n'ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n'uwa, unu nēdo onwe-unu n'okpuru iwu di iche iche enyere,

21. Ejidela, edetu-kwa-la ire, emetu-kwa-la aka

22. (bú ihe agēmebi ha nile emebi n'iji ha me ihe), dika ihe enyere n'iwu na ozizí madu si di?

23. Ọ bu ezie na ihe di otú a nwere nke anākpọ amam-ihe n'ikpe ekpere dika madu chọrọ, n'inwe kwa obi di ume-ala, n'ime kwa ka aru hu ahuhu; ma ha abughi ihe di oké ọnu-ahia ma-ọli megide ime ihe ọjọ nke gēju anu-aru afọ.