Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 8:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,

2. Onye nēfè òfùfè n'ebe nsọ ahu, na n'ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu.

3. N'ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n'iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n'iru Chineke.

4. Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ:

5. ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 8