Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 7:5-17 Bible Nso (IGBOB)

5. Ọ bu kwa ezie na ndi ahu ndi si n'etiti umu Livai puta ndi nānara ọlu onye-nchu-àjà nwere ihe enyere n'iwu inara ndi Israel otù uzọ n'uzọ iri dika iwu-ha si di, nke ahu bu, inara umu-nne-ha, ọ bu ezie na ha esiwo n'afọ Abraham puta:

6. ma onye ahu nke anēsiteghi na ha gu akukọ osuso-ọmumu-ya anarawo Abraham otù uzọ n'uzọ iri, gọzi kwa onye nwere nkwa ndia.

7. Ma apughi ikwugide nka okwu ọ bula na onye ka nma nāgọzi onye dikariri ntà.

8. Ọzọ, n'ebe a madu ndi nānwu anwu nānata otù uzọ n'uzọ iri; ma n'ebe ahu otù onye nānata ha, nke anāb͕ara ya àmà na ọ di ndu.

9. Agēkwu otú a, na ọbuná Livai, onye nānata otù uzọ n'uzọ iri, na o site-kwa-ra n'aka Abraham nye otù uzọ n'uzọ iri;

10. n'ihi na ọ nānọ n'aha nna-ya n'oge ahu, mb͕e Melkizedek zutere ya.

11. Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?

12. N'ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa.

13. N'ihi na Onye ahu anēkwu ihe ndia bayere Ya eketawo òkè n'ebo di iche, nke ọ dighi onye ọ bula nyeworo aka n'ebe-ichu-àjà site na ya.

14. N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.

15. Ihe ayi nēkwu aputabigawo kwa ìhè ókè nke-uku kari, ma ọ buru na Onye-nchu-àjà di iche ebilie dika oyiyi Melkizedek si di,

16. Onye emeworo Ya ka Ọ buru onye-nchu-àjà, ọ bughi dika iwu nke ihe enyere n'iwu nye anu-aru si di, kama dika ike nke ndu nādighi-agwu agwu si di:

17. n'ihi na anāb͕ara Ya àmà, si,Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebiDika usoro Melkizedek si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 7