isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 6 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi nka ka ayi rapu okwu nke nmalite nke Kraist, ka anēburu kwa ayi rue n'itozu-okè; ka ayi ghara itọ ntọ-ala ọzọ nke bu nchèghari iji pua n'ọlu nile nwuru anwu, na okwukwe ekwere na Chineke,

2. ozizí nke ime-baptism, na nke ibikwasi-aka-n'isi, na nke nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, na nke ikpé ebighi-ebi.

3. Nka ka ayi gēme kwa, ma ọ buru na Chineke kwe.

4. N'ihi na ndi enyere ìhè otù mb͕e, ndi detu-kwa-ra onyinye elu-igwe ahu ire, ndi eme-kwa-ra ka ha keta Mọ Nsọ,

5. ndi detu-kwa-ra okwu Chineke ire hu ọ di nma, detu kwa ike nile nke oge gaje ibia ire,

6. ha we dahie, ọ bu ihe anāpughi ime bu ime ka ha buru ndi ọhu ọzọ ichèghari echèghari; ebe ha nākpọgidere onwe-ha Ọkpara Chineke n'obe ọzọ, debe kwa Ya n'ọnọdu-ihere n'iru ọra madu.

7. N'ihi na ala nke ṅuworo miri-ozuzo nke nēzokwasi ya ọtutu mb͕e, nke nēpuputa kwa nkpa-akwukwọ kwesiri ndi ahu, bú ndi anālu kwa ya ọlu n'ihi ha, ala ahu nēkère ngọzi si n'aka Chineke bia:

8. ma ọ buru na ọ nēweputa ogwu na uke, ọ bu ihe ajuru aju, di kwa ọbubu-ọnu nso; nke ọgwugwu-ya bu ire ya ọku.

9. Ma, ndi m'huru n'anya, emewo ka ayi kwere ihe ka nma bayere unu, bú ihe nke ha na nzọputa yikọ kwa, ọ bu ezie na ayi nēkwu otú a:

10. n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.

11. Ma ọ nāgu ayi agu ka unu nile n'otù n'otù we nēgosi otù inu-ọku-n'obi ahu ka unu we nwezue olile-anya-ayi rue ọgwugwu ihe nile:

12. ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.

13. N'ihi na mb͕e Chineke kwere Abraham nkwa, ebe Ọ nēnweghi onye ọ bula ka Ya uku iji ṅu iyí, O ji Onwe-ya ṅu iyí,

14. si, Me-elu-me-ala n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme ka i ba uba.

15. Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu.

16. N'ihi na madu ji onye ka ha uku aṅu iyi: iṅu-iyi bu-kwa-ra ha nkwubì-okwu nke okwu ọ bula, ime ka o guzosie ike.

17. N'otù uzọ ahu Chineke, ebe Ọ nēzube igosibiga ndi-nketa nke nkwa-Ya ókè kari na izù-Ya bu ihe nādighi-agha agha, O were iṅu-iyí b͕o okwu:

18. ka ayi we were ihe abua nādighi-agha, nke Chineke nāpughi ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi, bú ndi b͕abàra ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n'iru ayi;

19. bú olile-anya nke ayi nwere dika ihe njiko nke nkpuru-obi, nke bu ihe-ntukwasi-obi na ihe nēguzosi ike, nke nābà kwa nime ebe ahu nke di nime ákwà-nb͕ochi;

20. n'ebe Jisus batara n'ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.