isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ya mere ka ayi tua egwui ma, ebe nkwa ibà n'izu-ike-Ya fọduru, ọ di onye ọ bula n'etiti unu ọ gādi ka o rughi ya ma eleghi anya.

2. N'ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma, ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: ma okwu nke ha nuru abaraghi ha urù, n'ihi na ejighi okwukwe tunyere ha na ndi nuru n'ezie.

3. N'ihi na ayi, bú ndi kwere ekwe, nābà n'izu-ike ahu; dika O kwuworo, si,Dika M'ṅuru iyi n'iwem,Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli:ọ bu ezie na alusiri ọlu nile site na ntọ-ala nke uwa.

4. N'ihi na O kwuwo n'otù ebe okwu bayere ubọchi nke-asa otú a, si, Chineke we zuru ike n'ubọchi nke-asa n'ọlu-Ya nile;

5. ọzọ, Ọ si kwa n'ebe a,Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.

6. Ya mere ebe ọ foduru ka ufọdu ba nime ya, ndi eburu uzọ zie ozi ọma abàghi kwa nime ya n'ihi ekweyeghi-ekwenye,

7. O we kà otù ubọchi ọzọ, nēkwu nime Devid, mb͕e ogologo oge di otú a gasiri, si, Ta, dika ebuworo uzọ kwue, si,Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,Unu emela ka obi-unu sie ike.

8. N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.

9. Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke.

10. N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya.

11. Ya mere ka ayi nānu ọku n'obi ibà n'izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n'otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye.

12. N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.

13. Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.

14. Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.

15. N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.

16. Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà.