Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 3:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi,Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,

8. Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu,Dika emere n'ubọchi ọnwunwa ahu n'ọhia,

9. Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem,Hu kwa ọlum ọgu arọ abua.

10. N'ihi nka ọnuma dim n'obi megide ọb͕ọ a,M'we si, Ha nējehie mb͕e nile n'obi-ha:Ma ndi ahu amaghi uzọm nile;

11. Dika M'ṅuru iyí n'iwe m si,Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.

12. Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n'etiti unu ma eleghi anya, n'iwezuga onwe-ya n'ebe Chineke di ndu nọ:

13. kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie:

14. n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 3