Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 3:12-19 Bible Nso (IGBOB)

12. Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n'etiti unu ma eleghi anya, n'iwezuga onwe-ya n'ebe Chineke di ndu nọ:

13. kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie:

14. n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:

15. n'oge anēkwu, si,Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu.

16. N'ihi na òle ndi, mb͕e ha nuru, kpasuru obi-ilu? ọ̀ bughi kwa ndi nile ndi siri n'Ijipt puta site n'aka Moses?

17. Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n'obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia?

18. Ma òle ndi ka Ọ ṅuru iyi na ha agaghi-abà n'izu-ike-Ya, ma ọ bughi ndi nēkweyeghi?

19. Ayi riba-kwa-ra ama na ha apughi ibà nime n'ihi ekweghi-ekwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 3