Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 2:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. Ọ si,Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi,N'etiti nzukọ-Gi k m'gābù abu nye Gi.

13. Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem.

14. Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;

15. ka O we site kwa n'ọnwu naputa ndi ahu, ka ha ra, bú ndi ewere egwu ọnwu tinye n'ibu-orù n'ogologo ndù-ha nile.

16. N'ihi na ọ bu ihe amara nke-ọma na ọ bughi ndi-mọ-ozi ka Ọ nējide aka, kama Ọ nējide nkpuru Abraham aka.

17. O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.

18. N'ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n'ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 2