Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 12:22-24 Bible Nso (IGBOB)

22. kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,

23. bú nb͕akọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ n'elu-igwe, na Chineke, bú Onye-ikpé ọra madu, na mọ nke ndi ezi omume emeworo ka ha zue okè,

24. na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 12