Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 12:21-29 Bible Nso (IGBOB)

21. ka ihe ahu anēkiri si di kwa egwu nke-uku, Moses siri, Anamatu oké egwu, aru ma-kwa-ram jijiji:

22. kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,

23. bú nb͕akọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ n'elu-igwe, na Chineke, bú Onye-ikpé ọra madu, na mọ nke ndi ezi omume emeworo ka ha zue okè,

24. na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.

25. Lezienu anya ka unu ghara iju Onye ahu nēkwu okwu. N'ihi na asi na ndi ahu ab͕anarighi Ya, mb͕e ha juru Onye ahu Nke nādu ha ọdú n'elu uwa, ayi onwe-ayi agaghi-ab͕anari Ya kari nke-uku, bú ndi nāb͕akuta Onye ahu azu Nke nādu ọdú site n'elu-igwe:

26. Onye olu-Ya mere uwa ka o me nkpatu mb͕e ahu: ma ub͕u a ka O kweworo nkwa, si, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru nke Mu onwem gēji me ka ọ bughi nání uwa ma jijiji, kama elu-igwe kwa.

27. Ma okwu nka, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru, nēgosi nbubiga nke ihe ahu nke anēme ka ha me nkpatu, dika nke ihe emeworo, ka ihe ahu nke anēmeghi ka ha me nkpatu we digide.

28. N'ihi nka, ebe ayi nānata ala-eze nke anāpughi ime ka o me nkpatu, ka ayi nwe amara, ka ayi we site na ya were egwu Chineke na ujọ kpe ekpere n'uzọ nke gātọ Chineke utọ:

29. n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 12