Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 11:34-40 Bible Nso (IGBOB)

34. menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n'okwukwe me ka ha di ike site n'adighi-ike, me ka ha di ike n'agha, ndi sitere n'okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ.

35. Ndinyom natara ndi-ha ndi nwuru anwu site na nbilite-n'ọnwu: ma etib͕uru ndi ọzọ, ebe ha juru inata nb͕aputa-ha; ka ha we nata nbilite-n'ọnwu ka nma:

36. ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:

37. aturu ha nkume, akwọwara ha, anwara ha, ewere iru mma-agha b͕ue ha: ha yiri akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ na nkpà, anākpab͕u ha, anēmejọ ha

38. (ndi uwa nēkwesigh), nāwaghari n'ọhia na ugwu na ọb͕à na ọnu nke ala.

39. Ndia nile, ọ bu ezie na ab͕ara ha àmà site n'okwukwe-ha, ma ha anataghi nkwà ahu,

40. n'ihi na Chineke buru uzọ leputa ihe ka nma bayere ayi, ka aghara ime ka ha zue okè ma asi na ayi anọghi ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 11