Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 11:34-39 Bible Nso (IGBOB)

34. menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n'okwukwe me ka ha di ike site n'adighi-ike, me ka ha di ike n'agha, ndi sitere n'okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ.

35. Ndinyom natara ndi-ha ndi nwuru anwu site na nbilite-n'ọnwu: ma etib͕uru ndi ọzọ, ebe ha juru inata nb͕aputa-ha; ka ha we nata nbilite-n'ọnwu ka nma:

36. ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:

37. aturu ha nkume, akwọwara ha, anwara ha, ewere iru mma-agha b͕ue ha: ha yiri akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ na nkpà, anākpab͕u ha, anēmejọ ha

38. (ndi uwa nēkwesigh), nāwaghari n'ọhia na ugwu na ọb͕à na ọnu nke ala.

39. Ndia nile, ọ bu ezie na ab͕ara ha àmà site n'okwukwe-ha, ma ha anataghi nkwà ahu,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 11