Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 11:20-33 Bible Nso (IGBOB)

20. Okwukwe ka Aisak ji gọzie Jekob na Isọ, ọbuná ngọzi bayere ihe gaje ibia.

21. Mb͕e Jekob nānwu anwu, ọ bu okwukwe ka o ji gọzie umu-ndikom Josef n'otù n'otù; kpọ kwa isi ala nye Chineke, nādabere n'isi nkpa-n'aka-ya.

22. Mb͕e ndu Josef nāgwu, ọ bu okwukwe ka o ji kwue, ihe bayere ọpupu nke umu Israel; nye kwa iwu bayere ọkpukpu-ya.

23. Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n'ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n'iwu.

24. Mb͕e Moses toruru madu, ọ bu okwukwe ka o ji ju ka akpọ ya nwa-nwoke nke nwa-nwanyi Fero;

25. n'ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge;

26. ebe ọ guru ita-uta nke Kraist-ayi n'àkù dikariri àkù nile nke Ijipt uku: n'ihi na ọ wepuru anya-ya le nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ahu.

27. Okwukwe ka o ji rapu Ijipt, n'ihi na ọ tughi egwu ọnuma nke eze ahu: n'ihi na ọ nọgidesiri ike, dika ọ nāhu Onye ahu Nke anāpughi ihu Ya anya.

28. Okwukwe ka o ji me ememe ngabiga ahu, ya na nwusa ọbara ahu, ka onye ahu nēbibi umu eburu uzọ mu we ghara imetu ha aka.

29. Okwukwe ka ha ji gabiga n'etiti oké osimiri Uhie dika ọ bu ala kpọrọ nku: ma elomiri ndi Ijipt mb͕e ha nwara igabiga ya.

30. Okwukwe ka mb͕idi nke Jeriko ji da, mb͕e agasiri ha gburugburu ubọchi asa.

31. Okwukwe ka Rehab, bú nwanyi nākwa iko, ji ghara iso ndi nēkweyeghi ekweye lakọ n'iyi, ebe o were udo nata ndi ledoro obodo ahu anya.

32. Gini ka m'gēkwu kwa ọzọ? n'ihi na oge gāgwunarim ma ọ buru na akọm akukọ bayere Gideon, Berak, Samson, Jefta; ha na Devid na Samuel na ndi-amuma:

33. ndi sitere n'okwukwe lub͕u ala-eze, lu ọlu ezi omume, nata nkwa di iche iche, kpuchita ọnu ọdum,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 11