Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Galetia 6:4-12 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma ka onye ọ bula nwaputa ọlu nke aka ya, mb͕e ahu ka ọ gēnwe kwa ihe ọ gānyara isi n'ebe nání ya onwe-ya nọ, ọ bughi kwa n'ebe ibe-ya nọ.

5. N'ihi na madu nile n'otù nọtù gēbu ibu nke aka ha.

6. Ma onye ewere okwu ọnu nēzi okwu Chineke, ya me ka onye nēwere okwu ọnu nēzi ya so ya nēnwekọ ezi ihe nile.

7. Una ekwela ka eduhie unu; Chineke abughi onye anēlelì: n'ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n'ubi.

8. N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi

9. Ma ike agwula ayi n'obi n'ime ihe ọma: n'ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà.

10. Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.

11. Lenu otú nkpuru-akwukwọ m'ji aka nkem degara unu di okpotokpo.

12. Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha ma nma n'anu-aru n'iru madu, ndi ahu nērugide unu ka ebì unu úgwù; ihe ha ji me ya bu nání ka ewe ghara isob͕u ha n'ihi obe Kraist.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Galetia 6