Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Galetia 6:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.

2. Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a.

3. N'ihi na asi na madu nēchè na ya bu ihe, mb͕e ọ nābughi ihe ọ bula, ọ nāghọ onwe-ya aghughọ n'obi.

4. Ma ka onye ọ bula nwaputa ọlu nke aka ya, mb͕e ahu ka ọ gēnwe kwa ihe ọ gānyara isi n'ebe nání ya onwe-ya nọ, ọ bughi kwa n'ebe ibe-ya nọ.

5. N'ihi na madu nile n'otù nọtù gēbu ibu nke aka ha.

6. Ma onye ewere okwu ọnu nēzi okwu Chineke, ya me ka onye nēwere okwu ọnu nēzi ya so ya nēnwekọ ezi ihe nile.

7. Una ekwela ka eduhie unu; Chineke abughi onye anēlelì: n'ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n'ubi.

8. N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi

9. Ma ike agwula ayi n'obi n'ime ihe ọma: n'ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Galetia 6