Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Galetia 3:23-29 Bible Nso (IGBOB)

23. Ma mb͕e okwukwe akābiaghi, anēche ayi nche n'okpuru iwu, ebe anēmechibido ayi rue okwukwe ahu nke agaje ikpughe.

24. Ya mere iwu ahu aghọwo onye-ozìzí-ayi ikpọrọ ayi biakute Kraist, ka ewe site n'okwukwe gua ayi na ndi ezi omume.

25. Ma ebe okwukwe ahu biaworo, ayi anọghi ọzọ n'okpuru onye-ozizí.

26. N'ihi na unu nile bu umu Chineke, site n'okwukwe, nime Kraist Jisus.

27. N'ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist.

28. Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.

29. Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n'aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Galetia 3