Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Galetia 3:21-29 Bible Nso (IGBOB)

21. Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.

22. Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.

23. Ma mb͕e okwukwe akābiaghi, anēche ayi nche n'okpuru iwu, ebe anēmechibido ayi rue okwukwe ahu nke agaje ikpughe.

24. Ya mere iwu ahu aghọwo onye-ozìzí-ayi ikpọrọ ayi biakute Kraist, ka ewe site n'okwukwe gua ayi na ndi ezi omume.

25. Ma ebe okwukwe ahu biaworo, ayi anọghi ọzọ n'okpuru onye-ozizí.

26. N'ihi na unu nile bu umu Chineke, site n'okwukwe, nime Kraist Jisus.

27. N'ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist.

28. Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.

29. Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n'aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Galetia 3