Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Galetia 3:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi Galetia nēnweghi uche, ònye riri obi-unu, ndi ewere Jisus Kraist gosi ọra madu n'anya-unu, dika Onye akpọgidereri n'obe?

2. Náni nka ka m'nāchọ imata n'ọnu-unu, Ùnu sitere n'ọlu di iche iche nke iwu nata Mọ Nsọ, ma-ọbu na unu sitere n'ọnunu nke okwukwe nata Ya?

3. Ùnu bu ndi nēnweghi uche otú a? ebe unu malitere na Mọ Nsọ, ọ̀ bu n'anu-aru ka anēme ka unu zue okè ub͕u a?

4. Ùnu huru ọtutu ahuhu di otú a n'efu? ma asi na ọ bu ezie na unu huru ha n'efu.

5. Ya mere Onye ahu Nke nwe inyezu unu Mọ Nsọ, Nke nāluputa kwa ọlu di ike nime unu, Ò sitere n'ọlu di iche iche nke iwu ma-ọbu na o sitere n'ọnunu nke okwukwe nēme ya?

6. Dika Abraham kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya n'ezi omume.

7. Ya mere maranu na ndi sitere n'okwukwe, ndi ahu bu umu Abraham.

8. Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.

9. Ya mere ndi sitere n'okwukwe, ndia ka anāgọzi, ha na onye okwukwe ahu, bú Abraham.

10. N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha.

11. Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n'onye ezi omume n'iwu n'iru Chineke: n'ihi na, Onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu;

12. ma iwu ahu esiteghi n'okwukwe; kama, Onye nēme ihe ndia gādi ndu nime ha.

13. Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Galetia 3