Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Filipai 4:14-23 Bible Nso (IGBOB)

14. Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n'isom nwekọ nkpab͕um.

15. Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu;

16. n'ihi na ọbuná na Tesalọnaika unu zigara otù mb͕e ziga kwa mb͕e ọzọ ib͕om nkpà.

17. Ọ bughi na anamachọ onyinye ahu; kama anamachọ nkpuru ahu nke nāba uba iguyere unu.

18. Ma enwezuwom ihe nile, anamababiga kwa ókè: emewo ka m'zue ezù, ebe m'natara n'aka Epafrọdaitọs ihe nile si n'aka-unu bia, isisì nke ihe ísì utọ, àjà nke anānara nke-ọma, nke nātọ Chineke ezi utọ.

19. Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n'ebube si di, nime Kraist Jisus.

20. Ma otuto diri Chineke-ayi, bú Nna-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

21. Kelenu onye nsọ ọ bula nime Kraist Jisus. Umu-nna-ayi ndi mu na ha nọ nēkele unu.

22. Ndi nsọ nile nēkele unu, ma ndi nke èzí-na-ulo Sisa kachasi n'ikele unu.

23. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere mọ-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Filipai 4