Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 6:2-12 Bible Nso (IGBOB)

2. Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n'iwu nke nkwa diri ya),

3. ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n'elu uwa.

4. Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.

5. Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist;

6. ọ bughi n'uzọ ibu-orù-n'anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu;

7. were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bughi kwa madu:

8. ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n'aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya.

9. Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n'elu-igwe, ile-madu-anya-n'iru adighi kwa n'ebe Ọ nọ.

10. Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.

11. Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.

12. N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 6