Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 6:10-24 Bible Nso (IGBOB)

10. Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.

11. Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.

12. N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.

13. N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile.

14. Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume,

15. were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu;

16. tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.

17. Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke:

18. site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,

19. nēkpe kwa ekpere n'ihim, ka ewe nyem okwu n'isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma,

20. nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.

21. Ma ka unu onwe-unu we mata kwa ihe nile bayerem, otú m'nēme, Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, bu kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi nime Onye-nwe-ayi, ọ gēme ka unu mara ihe nile:

22. onye m'nēzigara unu ime otù ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.

23. Udo diri umu-nna-ayi, ya na ihu-n'anya nke ya na okwukwe yikọ, site na Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

24. Ka amara diyere ndi nile huru Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'anya n'emebighi-emebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 6