Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 6:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n'ihi na nka bu ihe ziri ezi.

2. Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n'iwu nke nkwa diri ya),

3. ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n'elu uwa.

4. Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.

5. Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist;

6. ọ bughi n'uzọ ibu-orù-n'anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 6