Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 3:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. Ọ bu n'ihi nka ka m'ji b͕ue ikperèm abua n'ala nye Nna-ayi,

15. Onye esitere na Ya gu eriri-nna nile ọ bula n'elu-igwe na n'elu uwa aha,

16. ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n'aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu;

17. ka Kraist we site n'okwukwe-unu bigide nime obi-unu; ka unu, ebe unu b͕agideworo nkpọrọgwu nime ihu-n'anya buru kwa ndi atọworo ntọ-ala nime ya,

18. ka unu we nara ike ighọta, unu na ndi nsọ nile, ihe bu obodobo na ogologo na idi-elu na omimi,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 3