Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 3:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi nka mu onwem Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus n'ihi unu ndi mba ọzọ,

2. asi na ọ bu ezie na unu nuru okwu bayere ọchichi-èzí-na-ulo nke amara Chineke ahu nke enyerem n'ebe unu nọ;

3. na emere ka m'mara ihe-omimi ahu n'uzọ nkpughe, dika m'deworo n'akwukwọ a na mbu n'okwu ole-na-ole,

4. nke unu gēji pu ihuta nghọtam n'ihe-omimi nke Kraist, mb͕e unu guru ya;

5. nke anēmeghi ka umu madu mara ya n'ọb͕ọ ọzọ, dika ekpughere ya ub͕u a nye ndi-ozi-Ya na ndi-amuma-Ya di nsọ nime Mọ Nsọ;

6. bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n'otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n'ozi ọma,

7. nke emerem ka m m'buru onye nēje ozi ya, dika onyinye nke amara ahu nke Chineke si di nke enyerem dika ilusi-ọlu-ike nke ike-Ya si di.

8. Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;

9. na inye ha nile ìhè ihu ihe bu ọchichi-èzí-na-ulo nke ihe-omimi ahu nke ezoworo nime Chineke site n'oge nile, Onye kère ihe nile;

10. ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n'ebe di n'elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n'aka nzukọ-Ya,

11. dika ìzù nke mb͕e nile ebighi-ebi si di nke O zubere nime Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi:

12. ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi.

13. N'ihi nka ariọm aririọ ka ike ghara igwu unu n'obi nime nkpab͕um nile n'ihi unu, nke bu otuto-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 3