Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 2:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa.

13. Ma ub͕u a nime Kraist Jisus unu onwe-unu, bú ndi nọ n'ebe di anya n'oge gara aga, unu ka emere ka unu nọ nso nime ọbara Kraist.

14. N'ihi na Ya onwe-ya bu udo-ayi, Onye mere ihe abua ahu ka ha buru otù ihe, Onye kwada-kwa-ra mb͕idi etiti nke ngige,

15. ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n'iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di;

16. ka O we were kwa obe-Ya me ka ha abua na Chineke di n'otù nime otù aru, ebe O b͕usiri iro ahu nime ya:

17. O we bia zì unu ndi nọ n'ebe di anya ozi ọma nke udo, zì kwa ndi nọ nso ozi ọma nke udo:

18. n'ihi na ayi abua sitere n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ.

19. Ya mere otù a unu abughi ndi-ọbìa na ndi nānọ dika ọbìa ọzọ site n'ub͕u a, kama unu soro ndi nsọ buru ndi amuru n'ala, unu bu kwa ndi èzi-na-ulo Chineke,

20. ewu-kwa-ra unu dika ulo n'elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya;

21. ọ bu kwa nime Ya ka ulo nile ọ bula anēwu n'ulo ahu, ebe anējikọ ha nke-ọma, nāba uba we buru ulo nsọ nime Onye-nwe-ayi;

22. Onye anēwukọ kwa unu onwe-unu nime Ya ka unu we buru ebe-obibi nke Chineke nime Mọ Nsọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 2