Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 2:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Unu onwe-unu ka O me-kwa-ra ka unu di ndu, mb͕e, unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na nmehie nile unu,

2. nke unu jeghariri nime ha n'oge gara aga n'uzọ oge nke uwa nka, dika onye-isi nke ike nke mbara-elu-igwe si chọ, bú mọ ahu nke nālusi ọlu ike nime umu nke ekweyeghi-ekwenye ub͕u a;

3. ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n'etiti ha n'oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa:

4. ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n'ebere, n'ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi,

5. ọbuná mb͕e ayi nọ n'ọnwu site na ndahie nile ayi, O mere ka ayi so Kraist dikọ ndu (ejiwo amara zọputa unu),

6. me kwa ka ayi so Ya si n'ọnwu bilikọ, me kwa ka ayi so Ya nọdukọ n'ebe di n'elu-igwe, nime Kraist Jisus:

7. ka Ọ we gosi ihe a n'oge nile gaje ibia, bú àkù nke amara-Ya di uku ri nne, n'obi-ọma n'ebe ayi nọ nime Kraist Jisus:

8. n'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke:

9. o siteghi n'ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi.

10. N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.

11. N'ihi nka chetanu, na n'oge gara aga unu onwe-unu, bú ndi mba ọzọ n'anu-aru, ndi ha nākpọ aha Ebìghi-úgwù, bú ndi anākpọ aha Obibì-úgwù, n'anu-aru, nke eji aka me;

12. na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 2