Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 1:13-23 Bible Nso (IGBOB)

13. Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà,

14. bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa-ayi, rue nb͕aputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya.

15. N'ihi nka mu onwem kwa, ebe m'nuru okwu bayere okwukwe di nime unu nke unu kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile,

16. ewepughi m aka n'ikele ekele bayere unu, nēhotakwa unu n'ekperem;

17. ka Chineke nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke ebube, we nye unu Mọ nke amam-ihe na nkpughe nime nmazu-Ya;

18. ebe emeworo ka anya obi-unu nara ìhè, ka unu we mata ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ebube nke ihe-nketa-Ya n'etiti ndi nsọ Ya,

19. mata kwa otú ike-Ya di uku ri nne n'ebe ayi nọ, bú ndi kwere, dika ilusi-ọ1u-ike nke idi-ike nke ike-Ya si di,

20. nke Ọ lusiri ike nime Kraist, mb͕e O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, me kwa ka Ọ nọdu n'aka-nri-Ya n'ebe di n'elu-igwe,

21. kachasi ha nile elu, bú ibu-onye-isi, na ichi-isi, na ike, na ibu-onye-nwe-madu, na aha ọ bula anākpọ ya aha, ọ bughi nání n'oge a, kama ọ bu kwa n'oge nke gaje ibia:

22. O do-kwa-ra ihe nile n'okpuru ukwu-Ya abua, ọ bu kwa Ya onwe-ya ka O mere ka Ọ buru isi n'elu ihe nile n'ebe nzukọ-Ya nọ,

23. nke bu aru-Ya, ozuzù nke Onye ahu Nke nāluzu ihe nile nime madu nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 1