Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 4:7-18 Bible Nso (IGBOB)

7. Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.

8. Ọzọ kwa, ekwensu kuru Ya ga ugwu di oké elu, we gosi Ya ala-eze nile nke uwa, na ebube-ha;

9. o we si Ya, Ihe ndia nile ka m'gēnye Gi, ọ buru na I gādà n'ala kpọ isi ala nyem.

10. Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.

11. Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi.

12. Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili;

13. O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:

14. ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,

15. Ala Zebulun na ala Naftali,N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan,Galili nke ndi-mba ọzọ,

16. Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiriHuru oké ìhè,Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu,Ndia ka ìhè walitere.

17. Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.

18. Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 4