Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 3:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma na mb͕e ahu Jọn Baptist biara, nēkwusa n'ọhia nke Judia,

2. si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.

3. N'ihi na nwoke a bu onye ekwuru okwu bayere ya site n'ọnu Aisaia onye-amuma, si,Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si,Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.

4. Ma Jọn onwe-ya nwere uwe-oyiyi-ya nke aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya; nri-ya bu kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia.

5. Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya;

6. ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 3