Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 28:11-20 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma mb͕e ha nāga, le, ufọdu nime òtù ndi-nche batara n'obodo ahu, kọrọ ndi-isi-nchu-àjà ihe nile mere.

12. Mb͕e ha na ndi-okenye zukọrọ, b͕a kwa ìzù, ha we nye ndi-agha ahu ego riri nne,

13. si, Sinu, Ndi nēso uzọ-Ya biara n'abali, zuru Ya n'ori mb͕e ayi nāraru ura.

14. Ọ buru kwa na nka ruru nti onye-isi, ayi onwe-ayi gārafu ya, me ka unu ghara icheb͕u onwe-unu.

15. Ha we nara ego ahu, me dika eziri ha: ewe b͕asa okwu a n'etiti ndi-Ju, rue ta.

16. Ma ndikom iri na otù ahu ndi nēso uzọ-Ya gara Galili, rue ugwu ebe Jisus gwara ha.

17. Mb͕e ha huru Ya, ha we kpọ isi ala nye Ya: ma ufọdu nwere obi abua.

18. Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem.

19. Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:

20. nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 28