64. Ya mere, nye iwu ka emechie ílì ahu si-ike rue ubọchi nke-atọ, ka ndi nēso uzọ-Ya ghara ibia zuru Ya la ma eleghi anya, we si ndi-Ju, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie: njehie ikpe-azu a gājọ kwa njọ kari nke-mbu.
65. Pailat siri ha, Unu nwere òtù ndi-nche: labanu, mechienu ya si-ike, dika unu matara.
66. Ha we ga, mechie ílì ahu si-ike, n'ika akàrà na nkume ahu, ha na òtù ndi-nche ahu yikọrọ.