Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 27:31-43 Bible Nso (IGBOB)

31. Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ahu, yikwasi Ya uwe-Ya nile, dupuga Ya ikpọgide Ya n'obe.

32. Ma mb͕e ha nāputa, ha huru otù nwoke onye Sairini, aha-ya bu Saimon: onye ahu ka ha jidere ka o so ha, ka o we būru obe-Ya.

33. Mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, Ebe okpokoro-isi,

34. ha we nye Ya manya-vine nke agwara òlùlù ka Ọ ṅua: ma mb͕e O deturu ya ire, Ọ chọghi ka Ọ ṅua.

35. Mb͕e ha kpọgidesiri Ya n'obe, ha kère uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà: ka o wee mezuo bụ ihe si n'ọnụ onye amụma Pita, Ha nēkere onwe-ha uwem, n'elu bụ ihe m n'eyi n'aru ka ha nēfe kwa nza.

36. ha we nọdu nēche Ya n'ebe ahu.

37. Ha debe-kwa-ra n'elu isi-Ya ihe eboro Ya nke edeworo n'akwukwọ, si, ONYE A BU JISUS EZE NDI-JU.

38. Mb͕e ahu akpọgidere ndikom abua tiyere Ya, bú ndi nāpunara madu ihe, otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe.

39. Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha,

40. nāsi kwa, Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ, zọputa Onwe-gi: ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'elu obe ridata.

41. Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nēme Ya ihe-ọchì, si,

42. Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n'elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya.

43. Ọ nātukwasi obi-Ya na Chineke; ka Ọ dọputa Ya ub͕u a, ọ buru na Ọ nāchọ Ya: n'ihi na Ọ siri, Abum Ọkpara Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 27